Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZRA 2

2
1Ma ndia bu umu ala ahu anāchi achi ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri na Babilon, ha we laghachi na Jerusalem na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya; 2ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel: 3umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua. 4Umu Shefataia, ọgu iri-na-asatọ na iri na abua. 5Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-asatọ na iri na ise. 6Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na abua. 7Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 8Umu Zatu, nnù abua na ọgu asa na ise. 9Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ. 10Umu Bani, nnù na ọgu iri-na-abua na abua. 11Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na atọ. 12Umu Azgad, nnù atọ na orú na abua. 13Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na isi. 14Umu Bigvai, nnù ise na ọgu abua na iri na isi. 15Umu Adin, nnù na ọgu abua na iri na anọ. 16Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ. 17Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na atọ. 18Umu Jora, ọgu ise na iri na abua. 19Umu Hashum, ọgu iri-na-otù na atọ. 20Umu Giba, ọgu anọ na iri na ise. 21Umu Bet-lehem, ọgu isi na atọ. 22Ndikom Netofa, ọgu abua na iri na isi. 23Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ. 24Umu Azmavet, ọgu abua na abua. 25Umu Kiriat-arim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ. 26Umu Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù. 27Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua. 28Ndikom Bet-el na Ai, ọgu iri-na-otù na atọ. 29Umu Nebo, ọgu abua na iri na abua. 30Umu Magbish, ọgu asa na iri na isi. 31Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 32Umu Harim, ọgu iri-na-isi. 33Umu Lod na Hadid na Ono, nnù na ọgu iri-na-isi na ise. 34Umu Jeriko, ọgu iri-na-asa na ise. 35Umu Senaa, nnù iteghete na orú na iri. 36Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ. 37Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 38Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa. 39Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa. 40Ndi Livai: umu Jeshua na Kadmiel, nke umu Hodavaia, ọgu atọ na iri na anọ. 41Ndi-ọbù-abù: umu Esaf, ọgu isi na asatọ. 42Umu ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ha nile di ọgu isi na iri na iteghete. 43Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot; 44na umu Kiros, na umu Siaha, na umu Padon; 45na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Akub; 46na umu Hagab, na umu Shamlai, na umu Hanan; 47na umu Gidel, na umu Gaha, na umu Reaia; 48na umu Rezin, na umu Nekoda, na umu Gazam; 49na umu Uza, na umu Pasea, na umu Besai; 50na umu Asna, na umu Meunim, na umu Nefisim; 51na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua; 52na umu Bazlut, na umu Mehida, na umu Hasha; 53na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema; 54na umu Nezia, na umu Hatifa. 55Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Hasoferet, na umu Peruda; 56na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel; 57na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazébaim, na umu Ami. 58Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua. 59Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adan na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, na nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta: 60umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 61Site kwa n'umu ndi-nchu-àjà: umu Habaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha. 62Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ha: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà. 63Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo. 64Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ, 65nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri, bú ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù. 66Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise; 67camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi. 68Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna, mb͕e ha biaruru ulo Jehova nke di na Jerusalem, ha nyere onwe-ha n'afọ-ofufo iwu ulo Chineke ime ka o guzo n'ọnọdu-ya: 69dika ike-ha si di ka ha tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ asa na nnù iri-na-abua na ọgu iri, na nnù pound ọla-ọcha iri-na-abua na ọgu iri, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà ise. 70Ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ufọdu nime ndi Juda, na ndi-ọbù-abù, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na Netinim, we biri n'obodo nile ha, Israel nile bi-kwa-ra n'obodo nile ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

EZRA 2: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye