Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 40:28-49

EZIKIEL 40:28-49 IGBOB

O we me ka m'si n'ọnu-uzọ-ama nke Ndida ba n'ogige di nime: o we tùa ọnu-uzọ-ama nke Ndida dika ọtùtù ndia si di; na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. Ulo-nbata di kwa ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ha di orú cubit na ise, obosara-ha di kwa cubit ise Ulo-nbata-ya nile chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua: nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere. O we me ka m'bata n'ogige di nime n'uzọ Iru-anyanwu: o we tùa ọnu-uzọ-ama ahu dika ọtùtù ndia si di: na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. Ulo-nbata-ya nile che-kwa-ra iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere. O we me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama nke Ugwu, o we tùa ya dika ọtùtù ndia si di; ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile; window di-kwa-ra ya buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. Akuku-ọnu-uzọ-ya abua chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku, na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo nwere. Otù ime-ulo na ọnu-uzọ-ya di kwa n'akuku-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile; n'ebe ahu ka ha nāsacha anu àjà-nsure-ọku. Ọzọ, n'ulo-nbata nke ọnu-uzọ-ama ka table abua di n'otù akuku, table abua di kwa n'akuku nke-ọzọ, ha ewe b͕ue n'elu ha àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma. Ọzọ, n'otù akuku n'èzí, ebe madu nārigoru oghere nke ọnu-uzọ-ama n'akuku Ugwu, ka table abua di; ọ bu kwa n'akuku ọzọ, nke diri uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, ka table abua di. Table anọ di n'otù akuku, table anọ di kwa n'akuku nke-ọzọ, n'akuku ọnu-uzọ-ama; ha di table asatọ nke ha nēb͕u ihe nchu-àjà n'elu ha. Table anọ di-kwa-ra àjà-nsure-ọke, nke nkume awara awa, ogologo-ha di otù cubit na nkera, obosara-ha di kwa otù cubit na nkera, idi-elu-ha di kwa otù cubit: n'elu ha ka ha nādọba kwa ihe nile nke ha ji eb͕u anu àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ. Nko nke ra ka otù ntù-ọbu-aka di kwa, nke akpọgidesiri ike nime ulo-nbata buruburu n'akuku nile: ọ bu kwa n'elu table nile ahu ka anu nke onyinye iji biaru nso di. Ọzọ, n'èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n'ogige di nime, nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n'uzọ Ndida: otù di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n'uzọ Ugwu. O we gwam okwu, si, Ime-ulo a, nke iru-ya di n'uzọ Ndida, diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a. Ma ime-ulo a nke iru-ya di n'uzọ Ugwu diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjà: ndia bu umu Zedok, ndi si n'etiti umu Livai abiakute Jehova nso ijere Ya ozi. O we tùa ogige ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise, obosara-ya di kwa ọgu cubit ise, o nwere akuku anọ ra nrata; ebe-ichu-aja di kwa n'iru ulo ahu. O we me ka m'biarue uzọ-nbata nke ulo ahu, o we tùa akuku-ọnu-uzọ nke uzọ-nbata ahu, cubit ise n'otù akuku, cubit ise n'akuku nke-ọzọ: obosara ọnu-uzọ-ama di kwa cubit atọ n'otù akuku, cubit atọ n'akuku nke-ọzọ. Ogologo uzọ-nbata ahu di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri na otù; ọbuná n'ihe-nrigo ahu nke ha ji arigo ya: ogidi di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, otù n'otù akuku, otù n'akuku ọzọ.