Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 37

37
1Aka Jehova we dikwasim, O we me ka m'pua apu nime Mọ nke Jehova, O we dọbam n'etiti ndagwurugwu ahu; ma ndagwurugwu ahu juputara n'ọkpukpu; 2O we me ka m'gabiga n'akuku ha buruburu n'akuku nile: ma, le, ha bara uba nke-uku n'elu ndagwurugwu; ma, le, ha kpọrọ nku nke-uku. 3O we sim, Nwa nke madu, Ọkpukpu ndia, hà gādi ndu? M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi mara. 4O we sim, Bue amuma n'elu ọkpukpu ndia, si ha, Unu ọkpukpu kpọrọ nku, nurunu okwu Jehova. 5Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ọkpukpu ndia: Le, Mu onwem gaje ime ka ume ba nime unu, unu ewe di ndu. 6M'gētiyekwasi kwa unu akwara, me ka anu-aru rigokwasi unu, M'gēkpuchi kwa unu akpukpọ-aru, tiye ume nime unu, unu ewe di ndu, we mara na Mu onwem bu Jehova. 7M'we bue amuma dika esiri nyem iwu: otù olu we da mb͕e m'nēbu amuma, ma, le, ime-nkpatu di, ọkpukpu we biarute onwe-ha nso, ọkpukpu n'ọkpukpu nke ya. 8M'we hu, ma, le, akwara dikwasi ha, anu-aru rigota-kwa-ra, akpukpọ-aru we kpuchie ha n'elu: ma ume adighi nime ha. 9O we sim, Buere ifufe amuma, bue amuma, nwa nke madu, si ifufe, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si n'ifufe anọ bia, gi ume, kukwasi ndia eb͕uru eb͕u ume, ka ha we di ndu. 10M'we bue amuma dika O nyerem iwu, ume we ba nime ha, ha we di ndu, guzo ọtọ n'ukwu-ha, buru oké usu-ndi-agha di uku ri nne. 11O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi. 12N'ihi nka bue amuma, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gēmeghe ílì nile unu, me ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim; M'gēme kwa ka unu bata n'ala Israel. 13Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'meghesiri ílì-unu, na mb͕e M'mesiri ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim. 14M'gētiye kwa Mọm nime unu, unu ewe di ndu, M'gēme kwa ka unu nọdu n'ala-unu: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
15Okwu Jehova we ruem nti, si, 16Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were otù osisi n'onwe-gi, de n'elu ya, Nke Juda, na nke umu Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: were kwa osisi ọzọ, de n'elu ya, Nke Josef, osisi Efraim, na nke ulo Israel nile ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: 17gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n'aka-gi. 18Ma mb͕e umu ndi-gi gāgwa gi okwu, si, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe i nọ? 19gwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gaje iwere osisi Josef nke di n'aka Efraim, na ebo nile nke Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù; M'gētiyekọ kwa ha na ya, bú osisi Juda, me ka ha ghọ otù osisi, ha ewe ghọ otù n'akam. 20Osisi abua ahu nke i nēde ihe n'elu ha gādi kwa n'aka-gi n'anya-ha. 21Gwa kwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem ganāchiputa umu Israel n'etiti mba nile, ebe ha jere, M'gāchikọputa kwa ha n'akuku nile, me ka ha bata n'ala-ha: 22M'gēme kwa ha otù mba n'ala-ha, n'ugwu nile nke Israel; otù eze gābu-kwa-ra ha nile eze: ha agaghi-abu kwa mba abua ọzọ, agaghi-ekera kwa ha ala-eze abua ọzọ ma-ọli: 23ha agaghi-eji kwa arusi nile ha, ma-ọbu ihe-árú nile ha, ma-ọbu njehie nile ha, meru onwe-ha ọzọ: kama M'gāzọputa ha n'ebe-obibi nile ha, ebe ha mehieworo, M'gēme kwa ka ha di ọcha: ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke. 24Orùm, bú Devid, gābu kwa eze-ha; ọ bu kwa otù onye-ọzùzù-aturu ka ha nile gēnwe: ọ bu kwa n'ikpém nile ka ha gējeghari, ukpurum nile ka ha gēdebe kwa, me ha. 25Ha gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi. 26Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo: ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ gābu n'ebe ha nọ: M'gēdo kwa ha, me ka ha ba uba, M'gētiye kwa ebe nsọm n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi. 27Ebe-obibim gādi kwa n'elu ha, M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi. 28Mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, Onye nēdo Israel nsọ, mb͕e ebe nsọm gādi n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

EZIKIEL 37: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye