Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 16:42-63

EZIKIEL 16:42-63 IGBOB

M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru gi, ekworom gēsi kwa n'aru gi wezuga onwe-ya, M'gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ. N'ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n'ihe ndia nile; n'ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n'isi-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n'ihe-árú-gi nile? Le, onye ọ bula nātu ilu gātu ilu bayere gi, si, Dika nne si di, otú a ka nwa-ya nwanyi di. Nwa-nwanyi nke nne-gi ka i bu, nke nāsọ di-ya na umu-ya oyi; ọ bu kwa nwa-nne nke umu-nne-gi ndinyom ka i bu, ndi sọrọ di-ha na umu-ha oyi: nne-unu bu onye Het, nna-unu bu kwa onye-Amorait. Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n'aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n'aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom. Ma ọ bughi n'uzọ di iche iche ha ka i jeworo ije, ọ bughi kwa dika ihe-árú nile ha si di ka i meworo; kama, dika agāsi na nke ahu bu nọ̄ ihe ntà, i we bibie onwe-gi kari ha n'uzọ-gi nile. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, emeghi, ya onwe-ya ma-ọbu umu-ya ndinyom, otú i meworo, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom. Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike. Ha we di elu n'obi, me ihe-árú n'irum: M'we wezuga ha mb͕e M'huru ya. Sameria kwa, ọ bughi ka nkera nke nmehie-gi nile ra ka o meworo; i we me ka ihe-árú-gi ba uba kari nke ha, i we gua umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume site n'ihe-árú-gi nile nke i meworo. Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume. M'gēme kwa ka ndọta-n'agha-ha chigharia, bú ndọta-n'agha nke Sọdọm na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke Sameria na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke ndi-gi adọtara n'agha n'etiti ha: Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n'ihi ihe nile nke i meworo, n'ikasi ha obi. Umu-nne-gi ndinyom, bú Sọdọm na umu-ya ndinyom, gēchighata n'ọnọdu mb͕e ochie ha, Sameria na umu-ya ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie ha, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie unu. Ma Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, abughi aha anuru n'ọnu-gi n'ubọchi npako-gi; tutu ekpughe ihe ọjọ gi, dika na mb͕e ita-uta nke umu-ndinyom Siria, na nke ndi nile nọ ya buruburu, bú umu-ndinyom nke ndi Filistia, ndi nāzọpia gi buruburu. Ajọ ihe-nzube-gi na ihe-árú-gi nile ka gi onwe-gi buruworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Emesowom i ọbuná otú i meworo, gi onye ledaworo ọb͕ub͕a-iyi anya n'imebi ọb͕ub͕a-ndu. Ma Mu onwem gēcheta ọb͕ub͕a-ndu Mu na gi b͕ara n'ubọchi mb͕e i di na nwata, M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi guzosiere gi ike. I gēcheta kwa uzọ-gi nile, ewe tiye gi n'ọnọdu-ihere, mb͕e i nara umu-nne-gi ndinyom, bú umu-nne-gi ndinyom nke-okenye na umu-nne-gi ndinyom nke-ntà: M'gēwere kwa ha nye gi ibu umu-gi ndinyom, ma ọ bughi site n'ọb͕ub͕a-ndu-gi. Mu onwem gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na i b͕ara guzosie ike; i we mara na Mu onwem bu Jehova: ka i we cheta, ihere ewe me gi, i we ghara isaghe kwa ọnu-gi ọzọ ma-ọli, n'ihi ihere-gi; mb͕e M'gēkpuchiworo gi-ri ihe nile i meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.