Okwu Jehova we ruem nti, si, Nwa nke madu, me ka Jerusalem mara ihe-árú-ya nile, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Jerusalem: Nputa-uwa-gi na ọmumu-gi sitere n'ala ndi Kenean; nna-gi ka onye-Amorait bu, ọ bu kwa nne-gi ka onye Het bu. Ma ọmumu-gi, n'ubọchi amuru gi ebìghi otubo-gi, ejighi kwa miri sa gi aru isacha gi; eteghi i nnú ma-ọli, ekeghi kwa gi ákwà-ọkiké ma-ọli. Ọ dighi anya mere gi ebere, imere gi otù ihe n'ihe ndia, inwe ọmiko n'aru gi; ma atufuru gi n'ọhia, n'ihi na asọwo gi onwe-gi oyi n'ubọchi amuru gi. M'we gabiga n'akuku gi, hu gi ka anāzọtọ gi n'ọbara-gi, M'we si gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu; e, asirim gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu. Ihe bara uba dika ihe-opupú nke ọhia ka M'meworo gi, i we ba uba, bùe ibù, biarue n'ihe-ichọ-nma kachasi ihe-ichọ-nma nile; i kpuru ara, agiri-isi-gi puchi-kwa-ra epuchi; ma gi onwe-gi b͕asiri ọtọ. M'we gabiga n'akuku gi, hu gi, ma, le, mb͕e-gi bu mb͕e ihe-gi nātọ utọ; M'we b͕asa ọnu-ọnu-ala uwe-nwudam n'aru gi, kpuchie ọtọ-gi, ṅuara gi iyi, Mu na i we b͕a ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), i we ghọ onye nkem. M'we sa gi miri, sachapu ọbara-gi n'aru gi, te gi manu. M'we yibe gi uwe akpara nke-ọma, yibe gi akpukpọ seal n'ukwu, chiri ezi ákwà ọcha ke gi n'úkwù, b͕okwasi gi nkisi. M'we ke gi ihe-ichọ-nma, tiye ọla-aka n'aka-gi abua, na iyab͕a n'olu-gi. M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi. Ewe ke gi ihe-ichọ-nma nke ọla-edo na ọla-ọcha; uwe-oyiyi-gi bu kwa ezi ákwà ọcha na nkisi na uwe akpara nke-ọma; utu ọka flour na manu-aṅu na manu ka i riri: i we mab͕ue onwe-gi na nma, o we gara gi nke-ọma, i we rue ala-eze. Aha i nwere we pua ba n'etiti mba nile n'ihi nma-gi; n'ihi na ihe zuru okè ka ọ bu, n'ihi ima-nmam nke M'tukwasiri gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
I we tukwasi nma-gi obi, kwa iko n'ihi aha-gi, wukwasi ikwa-iko-gi nile n'aru onye ọ bula nāgabiga; nke ya ka ọ bu. I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a. I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko, chiri uwe-gi nke akpara nke-ọma, kpuchie ha, ọ bu kwa manum na ihe-nsure-ọkum nēsì ísì utọ ka i chere n'iru ha. Nrim kwa nke M'nyere gi, bú utu ọka flour na manu na manu-aṅu, nke M'mere ka i rie, i che-kwa-ra ya n'iru ha ibu ísì utọ, o we di otú a; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. I we chiri umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi i muworom, i we chiri ha chuara ha àjà, ka ewe ripia ha. Ọ̀ bu ihe ntà, bú okwu ikwa-iko-gi nile, na i b͕uworo umum, rara ha nye, n'ime ka ha gabigakuru ha n'ọku? Ma n'ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n'ọbara-gi ka i bu kwa. O rue, mb͕e ihe ọjọ gi nile gasiri, (ahuhu, ahuhu diri gi! ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta,) na i wuworo onwe-gi ulo ikwa iko, me-kwa-ra onwe-gi ebe di elu n'amá nile ọ bula. N'isi-uzọ nile ọ bula ka i wuworo ebe-gi di elu, i we me ka nma-gi ghọ ihe-árú, i we ghebere onye-ngabiga ọ bula ukwu-gi abua, me ka ikwa-iko-gi ba uba. I we kwaso umu Ijipt, bú ndi-ab͕ata-obi-gi, ndi anu-aru-ha di uku, iko, me ka ikwa-iko-gi ba uba, ikpasum iwe. Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere. I we kwaso umu Asiria iko, n'ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi. I we me ka ikwa-iko-gi ba uba n'ebe ala ndi-ahia di, rue Kaldea; ma ọbuná na nka ka afọ nējughi gi. Le, ka obi-gi si ata aru nke-uku! (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ bu na i nēme ihe ndia nile, bú ọlu nwanyi nākwa iko nke nēme ka o si tọ ya; ọ bu na i nēwu ulo ikwa-iko gi n'isi uzọ nile ọ bula, ebe-gi di elu ka i mewo-kwa-ra n'amá nile ọ bula; ma i dighi ka nwanyi nākwa iko n'ichì onyinye ọchì. Le nwanyi nākwa iko! mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya ọ nēwere ndi nābughi di-ya! Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile. Gi na ndinyom ọzọ we di iche n'ikwa-iko-gi nile otú a, na ọ dighi onye nākwaso gi iko: na ebe i nēnye onyinye, ma ọ dighi onyinye enyeworo gi, i we ghọ onye di iche.
N'ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova: Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N'ihi na awusiwo ọla-gi, na n'ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n'ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n'anya; na n'ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha; n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile. M'gēkpe kwa gi ikpe nile nke ndi bu nwunye nākwa iko, ndi nāwusi kwa ọbara; M'gēwere kwa gi nye ka i buru ọbara nke ọnuma na nke ekworo. M'gēnye kwa gi n'aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ. Ha gēme kwa ka nkpọkọta rigota imegide gi, ha gēwere kwa nkume tub͕ue gi, were mma-agha-ha dupue gi. Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.