Emesia Moses na Eron biara, si Fero, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, nāsi, Zipu ndim, ka ha we merem ememe n'ọzara. Fero we si, Ònye bu Jehova, na m'gēge nti n'olu-Ya izipu Israel? amaghm Jehova, ọzọ kwa, m'gaghi-ezipu Israel. Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi. Eze Ijipt we si ha, N'ìhi gini ka unu, bú Moses na Eron, nēme ka ndi ahu rapu ọlu-ha nile? jenu ibu-unu. Fero si-kwa-ra, Le, ọtutu ka ndi ala nka di ub͕u a, unu nēme kwa ka ha kwusi n'ibu ibu nile ha. N'ubọ-chi ahu Fero we nye ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike na ndi nēle ha anya n'ọlu iwu, si, Unu enye-kwa-la ndi ahu okporo-ọka ọzọ ikpu brick, dika na mb͕e gara aga: ha onwe-ha gēje chikọtara onwe-ha okporo-ọka. Ọnu-ọgugu brick, nke ha onwe-ha nākpu na mb͕e gara aga, ka unu gātukwasi ha; unu agubìla ihe nime ya: n'ihi na ndi-ume-ngwu ka ha bu; n'ihi ya ka ha onwe-ha nēti nkpu, si, Ka ayi je, chuara Chineke-ayi àjà. Ka òfùfè-ha di arọ́ n'aru ndikom ahu, ka ha we lua ọlu nime ya; ha ele-kwa-la okwu-ugha anya ọma. Ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike we pua, ha na ndi nēle ha anya n'ọlu, ha we gwa ndi ahu okwu, si, Otú a ka Fero siri, M'gaghi-adi nēnye unu okporo-ọka. Unu onwe-unu je, werenu okporo-ọka n'onwe-unu n'ebe ọ bula unu gāchọta ya, n'ihi na ọ dighi ihe agāgubì n'òfùfè-unu. Ndi Israel we b͕asa n'ala Ijipt nile ichikọta ahihia-ọka n'ọnọdu okporo-ọka. Ndi nāchi ha n'ihe-ike nēme ngwa, si, Luzeunu ọlu-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya, dika mb͕e okporo-ọka di. Ewe tie ha ihe, bú ndi nēle umu Israel anya n'ọlu, nke ndi Fero ndi nāchi umu Israel n'ihe-ike doro isi-ha, ewe si ha, Gini mere unu aluzughi òkè-unu ma nyahuru ma ta, n'ikpu brick dika na mb͕e gara aga?