Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 4

4
1Moses we za, si, Ma, le, ha agaghi-ekwem, ha agaghi-ege kwa nti n'olum: n'ihi na ha gāsi, Jehova emeghi ka i hu Ya anya. 2Jehova we si ya, Gini bu ihe ahu di n'aka-gi? Ọ si, Nkpa-n'aka. 3Ọ si, Tuda ya n'ala. Ọ we tuda ya n'ala, o we ghọ agwọ; Moses we b͕apu n'iru ya. 4Jehova we si Moses, Setipu aka-gi, jide ya n'ọdùdù: (ọ we setipu aka-ya, jide ya, ọ we ghọ nkpa-n'aka-ya:) 5ka ha we kwe na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, emewo gi ka i hu Ya. 6Jehova si-kwa-ra ya ọzọ, Biko, tiye aka-gi n'obi-gi. Ọ we tiye aka-ya n'obi-ya: ọ we weputa ya, ma, le, aka-ya bu ekpenta, dika aku mmiri igwe. 7Ọ we si, Tiyeghachi aka-gi n'obi-gi. (Ọ we tiyeghachi aka-ya n'obi-ya; ọ we weputa ya n'obi-ya, ma, le, ọ we dighachi ka anu-aru-ya.) 8O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi gi, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'ọlụ ihe-iriba-ama mbu, na ha gēkwe ọlụ ihe-iriba-ama nke ikpe-azu. 9O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi kwa ihe-iriba-ama abua ndia, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'olu-gi, na i gēwere ufọdu nime miri nke osimiri Nail, wusi ya n'ala-akọrọ: miri ahu nke i nēweputa n'osimiri Nail gāghọ kwa ọbara, ọ gāghọ ọbara n'ala-akọrọ. 10Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu. 11Jehova we si ya, Ònye tiyeworo ọnu madu nwere? ma-ọbu ònye nēme madu ka ọ buru onye-ob͕i, ma-ọbu onye nti chiri, ma-ọbu onye nāhu uzọ, ma-ọbu onye-ìsì? Ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? 12Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu. 13Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga. 14Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya. 15I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme. 16Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke. 17Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.
18Moses we je, laghachikuru Jetro, bú nna nwunye-ya, si ya, Biko, ka m'je, laghachikuru umu-nnem ndi nọ n'Ijipt, hu ma ha nọ ndu ub͕u a. Jetro we si Moses, Je n'udo. 19Jehova we si Moses nime Midian, Je, laghachi n'Ijipt: n'ihi na ndikom ahu nile ndi nāchọ ndu-gi anwuruwo. 20Moses we chiri nwunye-ya na umu-ya ndikom, me ka inyinya-ibu buru ha, ọ we laghachi n'ala Ijipt: Moses we were nkpa-n'aka Chineke n'aka-ya. 21Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n'Ijipt, le anya ka i me n'iru Fero ihe-ebube nile nke M'tiyere n'aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim. 22I gāsi kwa Fero, Otú a ka Jehova siri, Nwam, bú ọkparam, ka Israel bu: 23M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi. 24O rue, n'uzọ n'ebe inọ ọnọdu-abali, na Jehova zutere ya, chọ ime ka ọ nwua. 25Zipora we were ọ́mú, bipu api nwa-ya, me ka ọ metu ukwu abua nke di-ya; Zipora we si, N'ezie di nke ọbara ka i bu n'ebe m'nọ. 26Ọ we rapu ya ndu. Mb͕e ahu Zipora siri, Di nke ọbara ka i bu, bayere obibì-úgwù.
27Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n'ugwu Chineke, sutu ya ọnú. 28Moses we gosi Eron okwu nile nke Jehova, bú nke O zitere ya ka o kwue, na ihe-iriba-ama nile Ọ nyere ya iwu ka ọ me. 29Moses na Eron we je chikọta ndi-okenye nile nke umu Israel: 30Eron we kwue okwu nile nke Jehova gwara Moses, ọ me kwa ihe-iriba-ama nile n'anya ndi Israel. 31Ndi ahu we kwere: mb͕e ha nuru na Jehova letarari umu Israel, na Ọ hu-kwa-rari nweda-n'ala nke ha, ha rube isi kpọ isi ala.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 4: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye