Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 35:10-35

ỌPUPU 35:10-35 IGBOB

Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu; ebe-obibi ahu, na ulo-ikwū-ya, na ákwà-nkpuchi-ya, na nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile, na ib͕e ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi; na table ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na achicha iru Chineke; na ihe-idọba-oriọna nke ihe nēnye ìhè, na ihe-ya nile, na oriọna-ya nile, na manu itiye n'ihe nēnye ìhè; na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na nkpa-n'aka-ya abua, na manu nke otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ nke ebe-obibi ahu; na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya; na ákwà-ngechi nile nke ogige, na ide-ya nile, na ukwu-ha, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu: na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu; na ǹtú nile nke ogige, na udọ̀ nile ha; na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-àjà, nwere, na uwe umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà. Nzukọ nile nke umu Israel we si n'iru Moses pua. Ha we bia, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya, na onye ọ bula nke mọ-ya mere ka o nwe afọ-ofufo, ha we weta àjà-nbuli Jehova, iji je ozi ulo-ikwū nzute ahu, na iji fè òfùfè-ya nile, na iji me uwe nsọ ahu. Ha we bia, ma ndikom ma ndinyom, onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ha we weta ihe-nkpọchi-uwe, na nb͕a-aka imi, na nb͕a-aka-akàrà, na ihe anēyi n'olu, ihe ọla-edo ọ bula; bú onye ọ bula nke fere àjà-ofufé ọla-edo nye Jehova. Onye ọ bula nke achọtara n'aka-ya ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu, na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, chitara ha. Onye ọ bula nke nēbuli àjà-nbuli nke ọla-ọcha na ọla wetara àjà-nbuli nke Jehova: nwoke ọ bula, nke achọtara osisi acacia n'aka-ya iji je ozi nke òfùfè ahu, we weta ya. Nwayi ọ bula nke nwere obi amam-ihe were kwa aka-ya tu ogho, ha we weta ogho nke ha turu, bú ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu. Ndinyom nile ndi obi-ha kwaliri ha n'amam-ihe tu-kwa-ra aji ewu. Ndi-isi chitara nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod ahu, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi ahu; na uda ahu, na manu ahu; itiye n'ihe nēnye ìhè, na ibu manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me. Nwoke ọ bula na nwayi ọ bula, ndi obi-ha mere ka ha nwe afọ-ofufo iweta ihe iji je ozi nile, nke Jehova nyere iwu ka eme n'aka Moses, umu Israel ahu wetara onyinye afọ-ofufo nye Jehova. Moses we si umu Israel, Lenu, Jehova akpọwo Bezalel n'aka, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda; Ọ mejuwo kwa ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula; ya na icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ilu ọlu onye-ọ̀ka na nkume ihiọgide ahiọgide, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula nke onye-ọ̀kà. Ọ bu kwa izí ihe ka O tiyeworo n'obi-ya, ya onwe-ya na Ọhọliab, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan. O me-juwo ha n'amam-ihe nke obi, ije ozi ọ bula, nke onye nātu akika, na nke onye-ọ̀kà, na nke onye-ọdudu-ákwà, bú n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha, na nke ọkpa-ákwà, bú ije ozi nke ndi nēje ozi ọ bula, na nke ndi nēcheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche.