Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n'ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n'ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi; n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya. Eron we si ha, Tijipunu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti nke nwunye-unu, na nke umu-unu ndikom, na nke umu-unu ndinyom, chitaram ha. Ndi ahu nile we tijipu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti-ha, chitara ha Eron. Ọ we nara ya n'aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa. Eron we hu ya, we wue ebe-ichu-àjà n'iru ya; Eron we kpọ òkù, si, Ememe ka agēmere Jehova echi. Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, sure àjà-nsure-ọku, chita kwa ihe àjà-udo; ndi ahu we nọdu ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.
Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, rida; n'ihi na ndi-gi, nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, ebibiwo onwe-ha: ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa: ha eme-woro onwe-ha nwa-ehi akpuru akpu, ha we kpọ isi ala nye ya, chu-kwa-ra ya àjà, si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.