Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n'aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim. Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n'aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla; na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu; na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia; na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me; na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi. Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha. Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.
Gụọ ỌPUPU 25
Geere nke a ntị ỌPUPU 25
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 25:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị