Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 20:1-17

ỌPUPU 20:1-17 IGBOB

Chineke we kwue okwu ndia nile, si, Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta. Gi enwela Chi ọzọ tiyerem. Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa: gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu. Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi. Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ. Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile: ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ. Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. Gi eb͕ula madu. Gi akwala iko. Gi ezula ori. Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi. Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.