O rue na mb͕e ahu, mb͕e Moses toputaworo, na ọ pukuru umu-nne-ya, ihu ihe ngbu ha anya: o we hu nwoke Ijipt ka o nētib͕u nwoke Hibru, otù nime umu-nne-ya. Ọ we lee anya n'otù akuku, lee kwa anya n'akuku ọzọ, ma mb͕e ọ huru na ọ dighi onye ọ bula, o tib͕ue onye Ijipt ahu, zobe ya n'ájá. Ọ we pua n'ubọchi nke-abua, ma, le, ndikom Hibru abua nālu ọ̀gù: ọ we si onye ahu nke ikpe mara, N'ìhi gini ka i nētib͕u nwanne gi? Ọ si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpe n'ebe ayi nọ. Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nēkwu okwu-ya, dika i b͕uru onye Ijipt? Moses we tua egwu, si, N'ezie amawo okwu a. Fero we nu okwu a, ọ we chọ ib͕u Moses. Moses we b͕apu n'iru Fero, nọdu n'ala Midian: o we nọdu ala n'akuku olùlù-miri. Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua. Ndi-ọzùzù-aturu we bia, chupu ha: ma Moses biliri, zọputa ha, me ka ìgwè ewu na aturu-ha ṅua miri. Ha we biakute Reuel, bú nna-ha, ọ si, Gini mere unu ji bia ngwa ngwa ta? Ha si, Nwoke Ijipt o setara ayi miri nke-ọma, me ka ìgwè ewu na aturu-ayi ṅua. Ọ si umu-ya ndinyom, Òle ebe ọ nọ kwa? n'ìhi gini bu nka na unu arapuwo nwoke ahu? kpọnu ya, ka o we rie nri. Moses we kwere ibiri n'ulo nwoke ahu: o we nye Moses Zipora nwa-ya nwanyi na nwunye. Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, Moses we kpọ aha-ya Giashom: n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'bu-woro n'ala ọzọ.
O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu. Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara. Chineke we hu umu Israel, Chineke we mara.