Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu. Umu Israel we ba n'etiti oké osimiri ahu n'elu ala-akọrọ ahu: miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha, na n'aka-ekpe-ha. Ndi Ijipt we nāchu ha, so ha ba n'etiti oké osimiri, bú inyinya Fero nile, na ub͕ọ-ala-ya, na ndi-inyinya-ya. O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt. O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu oké osimiri, miri ahu gālata kwa n'aru ndi Ijipt, n'aru ub͕ọ-ala-ha, na n'aru ndi-inyinya-ha. Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri, oké osimiri ahu we lata n'orùrù o nērù mb͕e nile mb͕e chi bọrọ; ndi Ijipt we nāb͕apu n'ọbibia-ya; Jehova we richapu ndi Ijipt n'etiti oké osimiri. Miri ahu we lata, kpuchie ub͕ọ-ala nile, na ndi-inyinya, bú usu-ndi-agha nile nke Fero, ndi nēso ha n'azu ba nime oké osimiri; ọ dighi ma ọ buná otù onye fọduru nime ha. Ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri; miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha na n'aka-ekpe-ha. Jehova we zọputa Israel n'aka ndi Ijipt n'ubọchi ahu; Israel we hu ndi Ijipt ka ha nwuru anwu n'usọ oké osimiri. Israel we hu aka uku nke Jehova ji megide ndi Ijipt, ndi Israel we tua egwu Jehova, kwere na Jehova, na n'orù-Ya Moses.
Gụọ ỌPUPU 14
Geere nke a ntị ỌPUPU 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 14:21-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị