Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova. Ha si Moses, Ọ̀ bu n'ihi na ílì adighi n'Ijipt na i chipuwo ayi inwu n'ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n'ime ka ayi si n'Ijipt puta? Ọ̀ bughi nka bu okwu nke ayi gwara gi n'Ijipt, si, Rapu ayi, ka ayi we fè ndi Ijipt? N'ihi na ọ di ayi nma ifè ndi Ijipt, kari inwu n'ọzara. Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi. Jehova gēburu unu agha, ma unu onwe-unu gāb͕a nkiti.
Jehova we si Moses, Gini mere i nētikum? gwa umu Israel ka ha bulie ije. Gi onwe-gi weli kwa nkpa-n'aka-gi elu, setipu aka-gi n'elu oké osimiri, kewa ya: umu Israel gābà kwa n'etiti oké osimiri n'ala-akọrọ. Ma Mu onwem, le, M'nēme ka obi ndi Ijipt di ike, ha gēso kwa ha n'azu ba: agāsọ-purukwam n'aru Fero, na n'aru usu-ndi-agha-ya nile, n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya. Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e agāsọpurum n'aru Fero, na n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya.