Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ala Ijipt, si, Ọnwa nka gāburu unu isi ọnwa nile: ọnwa mbu nime ọnwa nile nke arọ ka ọ gāburu unu. Gwanu nzukọ nile nke Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri nke ọnwa nka ka ha gēwere n'onwe-ha, onye ọ bula o were nwa-aturu, dika ulo nna-unu-hà si di, ka otù nwa-aturu diri otù ulo: ma ọ buru na ulo ahu dikari ntà iri nwa-aturu, ya onwe-ya na onye-ab͕ata-obi-ya nke bi nso ulo-ya gēwere kwa otù dika ọnu-ọgugu madu si di; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka unu gāguru nwa-aturu ahu ọgugu. Nwa-aturu unu nwere gābu nke zuru okè, oké nke b͕ara otù arọ: n'etiti aturu ma-ọbu n'etiti ewu ka unu gēsi weputa ya: ọ gābu-kwa-ra unu ihe-ndebe rue ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nka: nkpọkọta nile nke nzukọ Israel gēb͕u ya n'etiti ehihie na anyasi. Ha gēwere ufọdu nime ọbara-ya, tiyekwasi ya n'awara-uzọ abua na n'ọfiere-uzọ n'ulo nile nke ha gēri ya nime ha. Ha gēri anu-aru-ya n'abali ahu, aruru n'ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya. Unu erila ihe nime ya na ndu, ma-ọbu isi ya na miri ma-ọli, kama aruru n'ọkui; isi-ya tiyere ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, tiye-kwa-ra ihe-ime-ya. Unu agaghi-eme ka ihe ọ bula fọdu site na ya rue ututu; ma ihe fọduru site na ya rue ututu, n'ọku ka unu gēsure ya. Otú a ka unu gēri ya; n'iji ihe-ọkiké ke n'úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n'ukwù, na nkpa-n'aka-unu n'aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu. M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova. Ọbara ahu gāburu unu ihe-iriba-ama n'aru ulo nile ebe unu onwe-unu nọ: mb͕e M'huru ọbara ahu, M'gāgabiga unu, ọ dighi kwa ihe-otiti gādi n'aru unu ibu ihe-nbibì, mb͕e M'nētib͕u ndi bi n'ala Ijipt.
Gụọ ỌPUPU 12
Geere nke a ntị ỌPUPU 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 12:1-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo