Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 1:15-22

ỌPUPU 1:15-22 IGBOB

Eze Ijipt we si ndinyom Hibru ndi nēle ime, ndi aha otù onye nime ha bu Shifra, aha nke onye nke-abua bu kwa Pua: ọ si, Mb͕e unu nēle ime ndinyom Hibru, we hu ha n'elu oche ọmumu-nwa; ọ buru na nwa-nwoke ka ọ bu, unu gēme kwa ka ọ nwua; ma ọ buru na nwa-nwayi ka ọ bu, ọ gādi kwa ndu. Ma ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, ha emeghi kwa dika eze Ijipt gwara ha, ma ha debere umu-ndikom ndu. Eze Ijipt we kpọ ndinyom ahu nēle ime, ọ si ha, Gini mere unu ji me ihe a, we debe umu-ndikom ndu? Ndinyom nēle ime we si Fero, N'ihi na ndinyom Hibru adighi ka ndinyom Ijipt; n'ihi na ndi nwere ndu ka ha bu, ha nāmu kwa nwa tutu ndinyom nke nēle ime abiakute ha. Chineke we me ndinyom nēle ime nma: ndi Israel we ba uba, nwe kwa ume nke-uku. O rue, n'ihi na ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, na O mere èzí-na-ulo nye ha. Fero we nye ndi-ya nile iwu, si, Nwa-nwoke ọ bula amuru, n'osimiri Nail ka unu gētufu ya, ma unu gēdebe nwa-nwayi ọ bula ndu.