Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ESTA 5

5
1O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu. 2O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n'ogige, na ọ natara amara n'anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo nke di n'aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n'aka ahu. 3Eze we si ya, Gini ka i nāchọ, Esta, nwunye eze? gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēnye kwa gi. 4Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka eze na Heman bia ta n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nke m'meworo ya. 5Eze we si, Menu ka Heman me ngwa ime ihe Esta kwuru. Eze na Heman we bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere. 6Eze we si Esta n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme ya. 7Esta we za, si, Aririọm na ọchichọm bu; 8ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di. 9Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai. 10Ma Heman jisiri onwe-ya ike, ba n'ulo-ya; o we ziga, me ka ndi nāhu ya n'anya bia, ha na Zeresh, bú nwunye-ya. 11Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze. 12Heman we si, Ọzọ, Esta, bú nwunye eze, emeghi onye ọ bula ka o so eze bata n'ọṅuṅu-manya-vine nke o mere, ọ bu nání mu onwem; ọzọ kwa, echi ka akpọworo mu onwem jekuru ya, mu na eze. 13Ma ihe a nile adighi-ezurum, na mb͕e nile mu onwem nāhu Mọdekai, bú onye-Ju, ka ọ nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze. 14Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n'anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n'ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n'elu-ya: gi so kwa eze ba n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n'anya Heman; o we me osisi ahu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ESTA 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye