nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma; unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya; n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo. Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè. N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi. Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe; nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ. N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ. Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ; nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi; nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist
Gụọ NDI EFESỌS 5
Geere nke a ntị NDI EFESỌS 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI EFESỌS 5:10-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị