Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ihe riri nne ka ọ bu kwa n'aru madu: madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa. Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya: N'ihi na n'ihe-efu ka ọ biara, ọ bu kwa n'ọchichiri ka ọ nāla, eji kwa ọchichiri kpuchi aha-ya; ọzọ, ọ hughi anyanwu, ọ maghi kwa ihe ọ bula; izu-ike diri nka kari onye ahu: e, ọ buru na ọ di ndu nnù arọ abua na ọgu iri okpukpu abua, ma ọ hughi ezi ihe: ọ̀ bughi n'otù ebe ka ha nile nāla? Ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu diri ọnu-ya, ma otú ọ di, ọchichọ nkpuru-obi adighi-eju eju. N'ihi na gini ka onye mara ihe nwebigara ókè kari onye-nzuzu? ma-ọbu gini ka onye ewedara n'ala nwere, bú onye mara ijeghari n'iru ndi di ndu? Ọ di nma, bú ihe-ọhuhu nke anya abua, kari njeghari nke nkpuru-obi: nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe. Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù. Ebe ọtutu okwu di nke nēme ka ihe-efu ba uba, gini ka madu nwebigara ókè? N'ihi na ònye mara ihe diri madu nma na ndu-ya, ọnu-ọgugu ubọchi ndu efu ya nke ọ nēme dika onyinyo? n'ihi na ònye gēgosi madu ihe gādi n'okpuru anyanwu mb͕e ọ gasiri?
Gụọ EKLISIASTIS 6
Geere nke a ntị EKLISIASTIS 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EKLISIASTIS 6:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị