Onye nāhu ego n'anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n'anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu. Mb͕e ezi ihe nāba uba, ndi nēri ya abawo kwa uba: òle ngazi ọ nāgaziri onye-nwe-ya, ma-ọbughi iji anya-ya abua hu ya? Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura. Ihe ọjọ nke nēb͕u di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, bú àkù nke onye-nwe-ya nēdebe imejọ onwe-ya: àkù ahu we la n'iyì site na nweda-n'ala ọjọ; ọ buru kwa na ọ muwo nwa-nwoke, ọ dighi ihe ọ bula di ya n'aka. Dika o siri n'afọ nne-ya puta, puta n'ọtọ, out a ka ogālaghachi di ka ila dika o siri bia, ma ọ dighi ihe ọ bula o gēburu site na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, nke ọ gēwere n'aka-ya la. Nka bu kwa ihe ọjọ nēb͕u nb͕u, na n'ihe nile dika o siri bia, otú a ka ọ gāla: ọ̀ bu kwa ole ihe fọduru ya na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu inwe ifufe? Ọzọ, n'ubọchi-ya nile ọ bu n'ọchichiri ka o nēri ihe, anākpasu kwa ya iwe ri nne, o nwe-kwa-ra ọria na iwe. Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya. Ọzọ, madu ọ bula nke Chineke nyeworo àkù na ihe-nkpakọta, onye O mewo-kwa-ra ka o nwe ike iri nime ya, na ibūru òkè-ya, na iṅuri ọṅu nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu; nka bu onyinye Chineke.
Gụọ EKLISIASTIS 5
Geere nke a ntị EKLISIASTIS 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EKLISIASTIS 5:10-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị