Mu onwem we che iru ihu amam-ihe, na iwi-ara na nzuzu: n'ihi na gini ka madu nke nēso eze n'azu gēme? ọ bu ihe nke ha meworo na mb͕e di anya gara aga. Mu onwem we hu na amam-ihe kariri nzuzu, dika ìhè si kari ọchichiri. Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile. Mu onwem we si n'obim, Dika o si dabàra onye-nzuzu, otú a ka ọ nādabàram, ọbuná mu onwem; ma n'ìhi gini kwa ka mu onwem mara ihe kari? M'we kwue okwu n'obim, si, na nka bu kwa ihe-efu. N'ihi na ọ dighi ncheta diri onye mara ihe, dika ọ nēsighi adiri onye-nzuzu, rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na ihe nke di na mb͕e di anya gara aga, n'ubọchi nke nābia ha nile gābu ihe echezọrọ echezọ. Ònye mara ihe si kwa aṅa nwua dika onye-nzuzu? M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu: n'ihi na m'gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m'gasiri. Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, na nke m'meworo n'amam-ihe n'okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu. Mu onwem we chigharia ime ka obim ghara inwe ntukwasi-obi bayere ndọb͕u nile nke m'dọb͕ururi onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu. N'ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu di n'amam-ihe, na n'ihe-ọmuma, na n'izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n'ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne. N'ihi na gini ka madu nwere na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na nime ncheb͕u nke obi-ya, nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu? N'ihi na ubọchi-ya nile bu nání ihe-nb͕u, nkpasu-iwe ka nweda-n'ala-ya bu kwa; ọbuná n'abali obi-ya edinaghi iraru ura. Nka bu kwa ihe-efu.
Ọ dighi ezi ihe di nime madu nke nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ka nkpuru-obi-ya hu ezi ihe nime ndọb͕u nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu. Nka ka mu onwem hu-kwa-ra, na ọ bu n'aka Chineke ka o sitere. N'ihi na ònye nēri ihe, ma-ọbu ònye nēme ngwa iri ihe karim? N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.