Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sìe ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ́ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru. Obi onye mara ihe di n'aka-nri-ya; ma obi onye-nzuzu di n'aka-ekpe-ya. Ọzọ kwa, mb͕e onye-nzuzu nēje ije n'uzọ, obi-amam-ihe-ya nākọnari ya, ọ we si madu nile na onye-nzuzu ka ọ bu. Ọ buru na mọ nke onye nāchi achi ebilie imegide gi, arapula ọnọdu-gi; n'ihi na ime-nwayọ nēme ka nmehie uku di iche iche kwusi. Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ọ di ka ihe emere n'amaghi-ama nke nēsi n'aka onye nāchi achi aputa: etiyere nzuzu n'ebe di iche iche di elu ri nne, ma ndi-ọgaranya nānọdu n'ebe di ala. Ahuwom ndi-orù ka ha nānọkwasi n'inyinya, ahuwokwam ndi-isi ka ha nējeghari dika ndi-orù n'elu uwa. Onye nēgwu olulu, nime ya ka ọ gādabà; ọzọ, onye nētipú mb͕idi, agwọ gāta ya aru. Onye nēbupu nkume, o gēb͕u ya nb͕u site na ha; onye nāwa osisi nọ n'ize-ndu site na ya.
Gụọ EKLISIASTIS 10
Geere nke a ntị EKLISIASTIS 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EKLISIASTIS 10:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị