Mu onwem, bú Onye-nkpọkọta, abuwo eze Israel nime Jerusalem. M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala. Ahuwom ọlu nile nke aluworo n'okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe. Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya. Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n'onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne. M'we were obim nye ima amam-ihe, na ima iwi-ara na nzuzu: amawom na nka bu kwa ichọ ijide ifufe. N'ihi na ọ bu n'ọtutu amam-ihe ka ọtutu nkpasu-iwe di: ọzọ, onye nātukwasi ihe-ọmuma nātukwasi ihe-nb͕u.
Gụọ EKLISIASTIS 1
Geere nke a ntị EKLISIASTIS 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EKLISIASTIS 1:12-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị