Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya. Ọ we si,
Jehova siri na Sainai bia,
Si kwa na Sia walitere ha;
O siri n'ugwu Peran nwuputa,
O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia:
Ọku di n'aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha.
E, Ọ nāhu ndi nke Ya nile n'anya;
Ndi nsọ Ya nile di n'aka-gi:
Ndi ahu we nọdu ala n'ukwu-gi;
Onye ọ bula gānata ufọdu nime okwu-gi.
Iwu ka Moses nyere ayi,
Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.
Ọ we buru eze nime Jeshurun,
Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha,
Ebo nile nke Israel n'otù.
Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu;
Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.
Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si,
Jehova, nu olu Juda,
Me kwa ka ọ bakute ndi-ya:
Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù;
Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.
Ọ we kwue ihe bayere Livai, si,
Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi,
Onye I nwara na Masa,
Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;
Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;
Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;
Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;
N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,
Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.
Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile,
Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel:
Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi,
Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.
Jehova, gọzie àkù-ya,
Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ:
Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya,
Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.
O kwuru ihe bayere Benjamin, si,
Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya;
O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile,
Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.
Ọ we kwue ihe bayere Josef, si,
Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu;
Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi,
Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu,
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.
Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie,
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya,
Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà:
Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef,
Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.
Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya;
Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa:
Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa:
Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim,
Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.