Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 30:11-20

DEUTERONOMI 30:11-20 IGBOB

N'ihi na ihe a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi 'niwu ta, ọ bughi ihe kariri gi ime ka ọ bu, ọ bughi kwa ihe diri gi anya ka ọ bu. Ọ dighi n'elu-igwe, ka i we si, Ònye gārigoro ayi n'elu-igwe, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya? Ọ dighi kwa n'ofè oké osimiri, ka i we si, Ònye gāgabigara ayi n'ofè oké osimiri, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya? Kama okwu ahu di gi ezi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi, ka i we me ya. Le, etiyewom n'iru gi ta ndu na ezi ihe, na ọnwu na ihe ọjọ; n'ihi na mu onwem nēnye gi iwu ta ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, ka i we di ndu, ba kwa uba, ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzi kwa gi n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya. Ma ọ buru na obi-gi echigharia, i we ghara inu anu, kama eduhie gi, we kpọ isi ala nye chi ọzọ, we fè ha òfùfè; egosiwom unu ta, na unu aghaghi ila n'iyì; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ibà ka i nweta ya. Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m'tiyeworo n'iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi: ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ige nti olu-Ya, na irapara n'aru Ya: n'ihi na Ya onwe-ya bu ndu-gi, na ogologo nke ubọchi-gi: ka i we biri n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, inye ha.