Ọ gēru kwa, mb͕e ihe ndia nile gābiakwasi gi, bú ngọzi ahu na nkọcha ahu nke m'tiyeworo n'iru gi, mb͕e i gēme kwa ka ha biaghachi n'obi-gi n'etiti mba nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, nupuworo gi, mb͕e i gēwere kwa obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile laghachikuru Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa nti olu-Ya dika ihe nile si di nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gi onwe-gi na umu-gi; na Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ndi-gi adọtara n'agha lata, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru gi, laghachi, chikọputa gi nime ndi ahu nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, meworo ka i b͕asa. Ọ buru na onye nke gi enupuru enupu anọ na nsọtu elu-igwe, n'ebe ahu ka Jehova, bú Chineke-gi, gāchikọputa gi, n'ebe ahu ka Ọ gēweputa kwa gi. Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i ba n'ala ahu nke nna-gi-hà nwetara, i gēnweta kwa ya; Ọ gēme kwa gi nma, me kwa ka i ba uba kari nna-gi-hà. Jehova, bú Chineke-gi, gēbì kwa n'obi-gi, na obi nkpuru-gi, úgwù, iwere obi-gi nile, na iwere nkpuru-obi-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, ka i we di ndu. Jehova, bú Chineke-gi, gētiyekwasi ọb͕ub͕a-iyi ndia nile n'isi ndi-iro-gi, na n'isi ndi nākpọ gi asì, ndi churu gi. Gi onwe-gi gālaghachi kwa, ge nti olu Jehova, me ihe nile O nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta. Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i babiga uba okè n'omume nile nke aka-gi, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, bayere ezi ihe: n'ihi na obi gātọ kwa Jehova utọ ọzọ n'aru gi ime gi nma, dika obi tọrọ Ya utọ n'aru nna-gi-hà: mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke edeworo n'akwukwọ iwu a; mb͕e i were obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, chigharikute Jehova, bú Chineke-gi.