Ọ buru na i lezighi anya ime okwu nile nke iwu a nke edeworo n'akwukwọ a, ka i we tua egwu aha nka nke di nsọpuru di kwa egwu, JEHOVA, bú CHINEKE-GI; Jehova gēme kwa ka ihe-otiti-gi nile na ihe-otiti nile nke nkpuru-gi di ebube, ha gābu ihe-otiti uku, nke nānọgide kwa anọgide, na ọria ọjọ, nke nānọgide kwa anọgide. Ọ gēme kwa ka nriaria nile nke Ijipt biaghachi n'aru gi, bu nke i turu ujọ; ha gārapara kwa n'aru gi. Ọria ọ bula kwa, na ihe-otiti ọ bula, nke anēdeghi n'akwukwọ iwu a, ha ka Jehova gēme ka ha rigo n'aru gi, rue mb͕e agēkpochapu gi. Unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole, n'ebe unu diri ka kpakpando elu-igwe n'uba; n'ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi. Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n'aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n'aru unu ime ka unu la n'iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
Gụọ DEUTERONOMI 28
Geere nke a ntị DEUTERONOMI 28
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DEUTERONOMI 28:58-63
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị