Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 25:1-19

DEUTERONOMI 25:1-19 IGBOB

Mb͕e ise-okwu di n'etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n'onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu; ọ gēru kwa, ọ buru na onye nēmebi iwu kwesiri ka etie ya ihe, na onye-ikpé gēme ka o dina ala, ka eti kwa ya ihe n'iru ya, dika nke gēzù nmebi-iwu-ya, n'ọnu-ọgugu. Ọgu otiti abua ka o gēti ya, ọ gaghi-eti kari: ka ọ ghara ibu, ma asi na o gēti ya ọtutu otiti ka ndia, na agēlelì kwa nwa-nne-gi n'anya-gi. Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Mb͕e umu-nne ndikom gēbikọ, otù nime ha ewe nwua, ma ọ nweghi nwa-nwoke, nwunye onye ahu nke nwuru anwu agaghi-aburu nwoke ala ọzọ nwunye n'èzí: nwa-nne di-ya gābakuru ya, luru ya n'onwe-ya na nwunye, we lua ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe ọ nọ. Ọ gēru kwa, na ọkpara ọ gāmu gānọchi n'aha nke nwa-nne-ya nke nwuru anwu, ka aghara ihichapu aha-ya n'Israel. Ma ọ buru na ọ tọghi nwoke ahu iluru nwunye nwa-nne-ya na nwunye, nwunye nwa-nne-ya gārigoru ọnu-uzọ-ama, jekuru ndi-okenye, si, Nwa-nne dim nāju ime ka aha biliere nwa-nne-ya n'Israel, o kweghi ilu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe m'nọ. Ndi-okenye obodo-ya gākpọ kwa ya, gwa ya okwu: ma asi na o guzo, si, Ọ tọghm iluru ya na nwunye; nwunye nwa-nne-ya gābiaru ya nso n'anya ndi-okenye, tọpu akpukpọ-ukwu-ya n'ukwu-ya, b͕asa ya asọ n'iru, za ya, si, Otú a ka agēme nwoke ahu nke nēwulighi ulo nwa-nne-ya. Agākpọ kwa aha-ya n'Israel, Ulo nke onye atọpuru akpukpọ-ukwu-ya. Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n'aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya: i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere. Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà. Enwela n'ulo-gi uzọ ephah abua, nke-uku na nke-ntà. Nkume-isì-ihe zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe; ephah zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. N'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu, bu onye ọ bula nēme ihe ndia, onye ọ bula nēme ajọ omume. Cheta ihe Amalek mere gi n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta: otù o zutere gi n'uzọ, tib͕ue ndi-ikpe-azu n'etiti gi, ndi nile nādighi ike n'azu gi, mb͕e gi onwe-gi nāda #mbà, mb͕e ike gwu-kwa-ra gi; ma ọ tughi egwu Chineke. O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n'aka ndi-iro-gi buruburu, zuru ike, n'ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe; echezọla.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara