Mb͕e nwoke gāluru nwunye, we buru di-ya, ọ gēru kwa, ọ buru na nwayi ahu ahutaghi amara n'iru ya, n'ihi na ọ huwo ihe nēkwesighi ekwesi n'aru ya, na ọ gēdere ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya. Ma mb͕e o si n'ulo-ya pua, ọ gēje kwa buru nwunye nke nwoke ọzọ. Ma asi na nwoke nke-ikpe-azu ahu akpọ ya asì, de-kwa-ra ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya; ma-ọbu mb͕e nwoke nke-ikpe-azu ahu gānwu, bú nke lutara ya n'onwe-ya na nwunye; di mbu ya, nke zipuru ya, apughi ikpoghachi ya ọzọ iburu ya nwunye, mb͕e emerusiri ya; n'ihi na ihe-árú ka ọ bu n'iru Jehova: emela ka ala ahu mehie, bú nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibu ihe-nketa.
Gụọ DEUTERONOMI 24
Geere nke a ntị DEUTERONOMI 24
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DEUTERONOMI 24:1-4
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo