Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ: kama i ghaghi isaghere ya aka-gi, i ghaghi kwa inye ya ihe gēzuru ukọ-ya nke kọrọ ya n'ọnọdu ihe-ibe-ya. Lezie onwe-gi anya ka okwu nke jọb͕uru onwe-ya ghara idi n'obi-gi, si, Arọ nke-asa, bú arọ nrapu, di nso; anya-gi we jọ njọ n'aru nwa-nne-gi, bú ob͕eye, i we ghara inye ya ihe; o we kpọkue Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi. I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile. N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi.
Mb͕e agērenye gi nwa-nne-gi, bú nwoke Hibru, ma-ọbu nwayi Hibru, o we fè gi òfùfè arọ isi; n'arọ nke-asa i gēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya. Ma mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya, ezipula ya n'aka efu: i gēsi n'ìgwè ewu na aturu-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-ọka-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi, nyebiga ya okè; ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, ji gọzie gi ka i gēnye ya. I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, b͕aputara gi: n'ihi ya ka mu onwem nēnye gi ihe a n'iwu ta. Ọ gēru kwa, mb͕e ọ gāsi gi, M'gaghi-apu n'ebe i nọ; n'ihi na ọ nāhu gi na ulo-gi n'anya, n'ihi na ọ diri ya nma n'ebe i nọ; i gēwere kwa arà, rapue nti-ya na ọnu-uzọ, ọ gābu-kwa-ra gi orù mb͕e ebighi-ebi. Ọ bu kwa otú a ka i gēmere orù-gi nwayi. Ọ gaghi-adi ike n'anya-gi, mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya; n'ihi na okpukpu ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu ka o fèworo gi òfùfè arọ isi: Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi kwa gi n'ihe nile nke i nēme.