Mb͕e ahu ha zara, si n'iru eze, Daniel, onye bu otù nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ nughi olu-gi, eze, ma-ọbu isọ-nsọ ahu nke i kayeworo aha-gi, kama ub͕ò atọ n'ubọchi ka ọ nāriọ aririọ-ya. Mb͕e ahu eze, mb͕e ọ nuru okwu a, ọ jọrọ njọ n'anya-ya nke-uku, ọ bu kwa Daniel ka ọ tukwasiri obi-ya idọputa ya: we rue ọdida anyanwu ka ọ nọ nējisi ike inaputa ya. Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ha we si eze, Mara, gi eze, na iwu nke diri Midia na Peasia bu, na ọ dighi isọ-nsọ ọ bula ma-ọbu ukpuru ọ bula nke eze nēme ka o guzosie ike agāb͕anwe. Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi. Ewe bute otù nkume, tukwasi ya n'ọnu olùlù ahu; eze we were nb͕a-aka-akàrà-ya na nb͕a-aka-akàrà ndi-isi-ya ka ya; ka ewe ghara ib͕anwe ihe ezubere bayere Daniel. Mb͕e ahu eze lara n'ulo uku ya, nọ ọnọdu-abali nēbu ọnu: achibatakwaghi ubọ egwú n'iru ya: ura-ya fepu-kwa-ra n'anya-ya.
Gụọ DANIEL 6
Geere nke a ntị DANIEL 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DANIEL 6:13-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị