Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 2:1-23

DANIEL 2:1-23 IGBOB

Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya. Eze we si ka akpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi-mb͕asi na ndi Kaldea igosi eze nrọ-ya nile. Ha we bata guzo n'iru eze. Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu. Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa. Eze we za, si ndi Kaldea, Okwu nke siworo n'ọnum puta nēguzosi ike: asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a na isi-ya, agābọkasi unu, ọ bu kwa ulo nile unu ka agēme ebe-ikpofu-ahihia. Ma asi na unu akọ nrọ a na isi-ya, onyinye di iche iche na ugwọ-ọlu na nsọpuru uku ka unu gānata n'akam: n'ihi nka kọrọnum nrọ a na isi-ya. Ha zara nke ub͕ò abua, si, Ka eze zere ndi-orù-ya nrọ a, isi-ya ka ayi gākọ kwa. Eze zara, si, Mu onwem amasiwo na mb͕e a ka unu onwe-unu nāzuchapu, n'ihi na unu ahuwo na o nēguzosi ike site n'ọnum, bú okwu a: na asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a, otù ka iwu enyere unu bu: n'ihi na okwu-ugha nke bibi-kwa-ra ebibi ka unu zubekọworo ikwu n'irum, rue mb͕e mb͕e a gērughari: n'ihi nka zerem nrọ a, m'we mara na unu gākọrọm isi-ya. Ndi Kaldea zara n'iru eze, si, Ọ dighi onye ọ bula n'elu uwa nke puru ikọ isi okwu eze: n'ihi na ọ dighi eze ọ bula, ma-ọbu onye-isi, ma-ọbu onye nwere ike n'aru madu, juworo ode-akwukwọ di nsọ ọ bula, ma-ọbu dibia ọ bula, ma-ọbu onye Kaldea ọ bula, ajuju di otú a. Ajuju a nke eze nāju di ike, ọ dighi kwa onye ọzọ nke gākọ ya n'iru eze, ma-ọbughi nání chi-ayi, ndi ebe-obibi-ha nādighi n'etiti anu-aru, bú madu. N'ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n'iyi. Iwu ahu we puta; ewe gaje ib͕u ndi ahu mara ihe; ha we chọ Daniel na ndi-ibe-ya ka ewe b͕ue ha. Mb͕e ahu Daniel zaghachiri Ariok, bú onye-isi ndi-ob͕ū nke eze, nke puru ib͕u ndi-amam-ihe nke Babilon, okwu ndum-ọdu na ezi uche; ọ zara, si Ariok, bú onye nke eze nke nwere ike n'aru madu, N'ihi gini ka iwu a di ọku ọku site n'iru eze? Mb͕e ahu ihe Ariok mere ka Daniel mara okwu a. Daniel we bata, kpere eze ka o nye ya mb͕e akara àkà, ka o we kọrọ eze isi nrọ ahu. Mb͕e ahu Daniel lara n'ulo-ya, me ka Hananaia na Mishael na Azaraia, bú ndi-ibe-ya, mara okwu ahu: ka ha we riọ obi-ebere nile n'aka Chineke nke elu-igwe bayere ihe-nzuzo ahu; ka Daniel na ndi-ibe-ya we ghara isoro ndi-amam-ihe Babilon fọduru la n'iyì. Mb͕e ahu Daniel ka ekpughere ihe-nzuzo ahu nye n'ọhù nke abali. Mb͕e ahu Daniel gọziri Chineke nke elu-igwe. Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu: ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma: Ya onwe-ya nēkpughe ihe nile di omimi di kwa nzuzo: Ọ mawo ihe di n'ọchichiri, ìhè nēbi kwa n'ebe Ọ nọ. Gi, Chineke nke nnam-hà, ka mu onwem nēkele, nāja kwa, n'ihi na amam-ihe na idi-ike ka I nyeworom, ub͕u a ka I mewo-kwa-ra ka m'mara ihe ayi riọrọ n'aka Gi: n'ihi na okwu eze ka I meworo ka ayi mara.