Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 11:36-45

DANIEL 11:36-45 IGBOB

Eze ahu gēme kwa ka o si tọ ya; ọ gēbuli kwa onwe-ya, me onwe-ya uku n'elu chi nile ọ bula, ọ bu kwa Chineke nke chi nile ka ọ gēkwu oké okwu di iche iche megide: ọ gāga-kwa-ra ya nke-ọma rue mb͕e oké iwe gāgwusi; n'ihi na ihe akara àkà gēme. Ma ọ gaghi-atughari uche na chi nile nke nna-ya-hà, ma-ọbu n'ihe ahu ndinyom nāchọsi ike, ọ bu kwa na chi nile ọ bula ka ọ nāgaghi-atughari uche: n'ihi na n'elu ihe nile ka ọ gēme onwe-ya uku. Ma ọ bu chi nke ebe nile siri ike ka ọ gāsọpuru n'ọnọdu-ya: ọ bu kwa chi nke nna-ya-hà nāmaghi ka o gēji ọla-edo, ji kwa ọla-ọcha, ji kwa nkume di oké ọnu-ahia, ji kwa ihe di iche iche anāchọsi ike, sọpuru. Ọ gēmeso kwa ebe nile ewusiri ike nke ebe nile siri ike site n'iye-aka chi ala ọzọ: onye ọ matara gēme ka nsọpuru-ya ba uba; ọ gēme kwa ka ha chia ọra madu, ọ bu kwa ala ka ọ gēkè n'ọnu-ahia. Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga. Ọ gābà kwa n'ala ahu mara nma, ọ di kwa ọtutu ala gāsu ngọngọ: ma ndia ka agēme ka ha wepuga onwe-ha n'aka-ya: Edom, na Moab, na ndi-isi n'umu Amon. Ọ gēsetipu kwa aka-ya imegide ala nile: ala Ijipt agaghi-aghọ kwa ndi nāb͕apu ab͕apu. Ma ọ gēnwe ike n'àkù nile nke ọla-edo na ọla-ọcha, na n'ihe nile anāchọsi ike nke Ijipt: ndi Libia na ndi Etiopia gēso kwa na nzọ-ukwu-ya nile. Ma ihe di iche iche anuru site n'Ọwuwa-anyanwu, site kwa n'Ugwu, gēme ka ọ ma jijiji: ọ gēji kwa oké ọnuma pua ikpochapu na iwezuga ọtutu madu ka ebibie ha. Ọ gāma kwa ulo-ikwū nile nke ulo uku ya n'etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahu mara nma; ma ọ gābiaru ọgwugwu-ya, ọ dighi kwa onye ganēyere ya aka.