N'arọ nke-atọ nke Sairọs, bú eze Peasia, ekpughere Daniel, onye akpọrọ aha-ya Belteshaza, okwu; ọ bu kwa ezi-okwu ka okwu ahu bu, ọbuná obubu-agha uku: o we ghọta okwu ahu, nghọta di-kwa-ra ya n'ọhù ahu. N'ubọchi ahu mu onwem, bú Daniel, nọ nēru újú ogologo ízù atọ. Nri anāchọsi ike nke-uku ka m'nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n'ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru. Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa mbu, mb͕e mu onwem nọ n'akuku osimiri uku ahu, ya bu Hidekel, m'we welie anyam abua, hu, ma, le, otù onye yiri uwe ọcha, onye ekere ihe-ọkiké ọla-edo ọma nke Ufaz n'úkwù-ya: aru-ya di kwa ka beryl, iru-ya di kwa ka àmùmà si di n'ile ya anya, anya-ya abua di kwa ka ọwa nēnwu ọku, ogwe-aka-ya abua na ukwu-ya abua di kwa ka ib͕u-maramara nke ọla akwọchara akwọcha, olu okwu-ya nile di kwa ka olu ìgwè madu. Mu onwem, bú Daniel, náním, huru ọhù ahu: ma ndikom ahu ndi mu na ha nọ ahughi ọhù ahu; ma otù ọ di, oké ọma-jijiji dakwasiri ha, ha we b͕alaga izobe onwe-ha. Mu onwem we fọduru náním, m'we hu ọhù uku a, ike we ghara ifọdu nimem: n'ihi na ebubem b͕anwere ghọ ihe-nbibi n'arum, m'we ghara inagide ike ọ bula. M'we nu olu okwu-ya nile: ma mb͕e m'nuru olu okwu-ya nile mu onwem adawori n'oké ura kpue irum n'ala, irum we che n'ala. Ma, le, otù aka meturum, me ka m'guzo nāṅaghari n'elu ikperèm abua na ọbu-akam abua. O we sim, Daniel, onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku, ghọta okwu nile nke mu onwem nāgwa gi, gi guzo kwa ọtọ n'ebe-nguzo-gi; n'ihi na ub͕u a ka ezìworom biakute gi: mb͕e ọ kpayerem uka nka, m'we guzo ọtọ nāma jijiji. O we sim, Atula egwu, Daniel; n'ihi na site n'ubọchi mbu ahu mb͕e i nyere obi-gi ighọta ihe na iweda onwe-gi n'ala n'iru Chineke-gi, anuru okwu-gi nile: mu onwem abiawo kwa n'ihi okwu-gi nile. Ma onye-isi ala-eze Peasia nēguzo na ncherita-irum orú ubọchi na otù; ma, le, Maikael, bú otù nime ndi-isi ndi bu isi, biara iyerem aka: mu onwem we fọdu n'ebe ahu n'akuku ndi-eze Peasia. Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.