Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI KỌLỌSI 3:12-25

NDI KỌLỌSI 3:12-25 IGBOB

Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi; nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a: ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè. Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele. Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke. Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya. Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi. Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ. Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi. Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha. Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru n'ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n'anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n'afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi: ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu; ebe unu matara na ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist. N'ihi na onye nēme ajọ omume gānaghachi ajọ omume ahu o mere: ile-madu-anya-n'iru adighi kwa.