Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile, ebe ayi nuru okwu bayere okwukwe nke unu kwere na Kraist Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile, n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma, nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu; dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi, onye gosi-kwa-ra ayi ihun-anya-unu nime Mọ Nsọ. N'ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n'ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n'ikpe ekpere na iriọ aririọ n'ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ, ka unu jegharia n'uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n'uzọ nile, nāmi nkpuru n'ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke; ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù; nēkele Nna-ayi, Onye mere ka ayi rue iketa òkè-ayi n'ihe-nketa ndi nsọ n'ìhè
Gụọ NDI KỌLỌSI 1
Geere nke a ntị NDI KỌLỌSI 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI KỌLỌSI 1:3-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị