Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 7:1-60

ỌLU NDI-OZI 7:1-60 IGBOB

Onye-isi-nchu-àjà we si, Ìhe ndia di otú a? O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran, O we si ya, Si n'ala-gi na n'etiti ikwu-gi pua, bia n'ala ahu nke M'gēgosi gi. Mb͕e ahu o siri n'ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n'ebe ahu bia biri n'ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a: ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru. Ma Chineke kwuru okwu otú a, na nkpuru-ya gānọ dika ndi-ọbìa n'ala nābughi nke aka ha, na ndi ala ahu gēme kwa ha ka ha buru ndi-orù, me kwa ha ihe ọjọ, nnù arọ. Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a. O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua. Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya, weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n'iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum. Oké unwu we dikwasi Ijipt na Kenean dum, ya na oké nkpab͕u: nna-ayi-hà ahughi ihe gēju ha afọ. Ma mb͕e Jekob nuru na ọka di n'Ijipt, o we zipu nna-ayi-hà na mbu. Na nke mere ya ub͕ò abua ewe me ka umu-nne Josef mara Josef; ewe me ka ndi-aru Josef puta ìhè nye Fero. Josef we ziga, kpọ Jekob, bú nna-ya, na ikwu-ya nile, ka ha biakute ya, ọgu madu atọ na iri na ise. Jekob we ridata n'Ijipt; o we nwua, ya onwe-ya, na nna-ayi-hà; ewe būru ha gabiga n'ofè rue Shekem, tọb͕ọ ha n'ílì ahu nke Abraham were ọnu-ahia n'ọla-ọcha go n'aka umu Hemoa nime Shekem. Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n'iru ba kwa uba n'Ijipt, rue mb͕e eze di iche biliri ibu eze Ijipt, onye nāmataghi Josef. Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu. N'oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n'ulo-ya: ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere. Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile. Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya. Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt: ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi. N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu? Ma onye nēmejọ ibe-ya nupuru ya, si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpé n'ebe ayi nọ? Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nāchọ, dika i b͕uru onye Ijipt nyahuru? Moses we b͕alaga n'okwu a, we nọ dika ọbìa n'ala Midian, ebe ọ muru umu-ndikom abua. Mb͕e ọgu arọ abua zuru, ewe me ka ọ hu mọ-ozi n'ọhia nke ugwu Sainai, n'ire ọku nime osisi ntà. Ma mb͕e Moses huru ya, ihe ọ huru juru ya anya: ma mb͕e ọ nābiaru nso ikiri ya, olu nke Onye-nwe-ayi dara, si, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi-hà, Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob. Aru we ma Moses jijiji, o nweghi kwa anya-ike ikiri. Onye-nwe-ayi we si ya, Tọpu akpukpọ-ukwu n'ukwu-gi abua: n'ihi na ebe i nēguzo bu ala nsọ. N'ezie ahuwom ihe ọjọ anēme ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam isu-udè-ha, M'we ridata iweputa ha: ub͕u a bia kwa, M'gēziga gi n'Ijipt. Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n'osisi ntà ahu. Nwoke a duputara ha, mb͕e ọ lusiri ọlu-ebube di iche iche na ihe-iriba-ama di iche iche n'Ijipt, na nime Oké Osimiri Uhie, na nime ọhia ọgu arọ abua. Onye a bu Moses ahu, onye siri umu Israel, Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu. Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n'ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n'ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n'ọnu Chineke puta inye ayi: onye nna-ayi-hà nāchọghi iṅa nti, kama ha nupuru ya n'ebe ha nọ, we laghachi azu n'Ijipt n'obi-ha, nāsi Eron, Mere ayi chi ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, onye duputara ayi n'ala Ijipt, ayi amataghi ihe mere ya. Ha we kpua nwa-ehi n'ubọchi ahu, we butere arusi ahu ihe àjà, we ṅuria n'ọlu aka-ha. Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n'elu-igwe; dika edeworo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaram Ọ̀gu arọ abua n'ọhia, unu ulo Israel? Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk, Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan, Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha: M'gēme kwa ka unu je biri n'ofè Babilon. Nna-ayi-hà nwere ulo-ikwū nke àmà n'ọhia, dika Ọ kara àkà, bú Onye gwara Moses, ka o me ya ka ọ di ka ihe-atù nke ọ hururi. Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n'iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid; onye huru amara n'iru Chineke, we riọ ichọtara Chineke nke Jekob ebe-obibi. Ma Solomon wuru Ya ulo. Otú ọ di, Onye kachasi ihe nile elu adighi-ebi n'ulo eji aka wu; dika onye-amuma siri, Elu-igwe bu oche-ezem, Uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwum abua: Àha ulo gini ka unu gēwurum? ka Onye-nwe-ayi kwuru: Ma-ọbu gini bu ebe izu-ikem? Ọ̀ bughi akam mere ihe ndia nile? Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n'obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme. Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya: unu ndi natara iwu ahu dika enyere ya site n'aka ndi-mọ-ozi, ma unu edebeghi ya. Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ewe mapue ha n'obi-ha, ha we takwasi ya ikekere ezé-ha. Ma, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legide anya n'elu-igwe, we hu ebube Chineke, na Jisus ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke, o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke. Ma ha were oké olu ti nkpu, kpuchi kwa aka na nti-ha, were otù obi nukwasi ya; ha we tupu ya n'obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n'ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl. Ha we tua Stifen nkume, ka ọ nākpọku Onye-nwe-ayi, nāsi, Onye-nwe-ayi Jisus, nara mọm nke-ọma. O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.