Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 5:1-16

ỌLU NDI-OZI 5:1-16 IGBOB

Ma otù nwoke nke anākpọ aha-ya Ananaias, ya na Safaira nwunye-ya, rere otù ihe o nwere, we debere onwe-ya ufọdu nime ọnu-ahia-ya, nwunye-ya ma-kwa-ra, o we weta otù òkè, tọb͕ọ ya n'ukwu ndi-ozi. Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi? Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke. Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n'ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu. Ndi bu umu-okorọbia nime ha we bilie, ke ya ákwà, ha we bupu ya lìe ya. Ma ihe ra ka oge hour atọ gasiri, mb͕e nwunye-ya batara nime, nāmataghi ihe emereri. Pita we za ya, si, Gwam, ọ̀ bu ihe ra otú a ka unu rere iberibe ala unu? Ọ si, E, ihe ra otú a. Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n'ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi. O we da n'ala ngwa ngwa n'ukwu-ya, kubìe ume: umu-okorọbia ahu we bata, hu ya ka ọ nwuru, ha we bupu ya, lìe ya n'akuku di-ya. Nzukọ Kraist dum we tua oké egwu, ha na ndi nile ndi nuru ihe ndia. Ma emere ọtutu ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n'etiti ndi-Ju site n'aka ndi-ozi; ha nile were kwa otù obi nọ n'ìbà Solomon. Ma nime ndi fọduru ọ dighi onye ọ bula nwere anya-ike iwere onwe-ya rapara ha n'aru: otú ọ di, ndi-Ju nēme ka ha di uku; ewe tukwasi kari nye Onwe-nye-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndkom ma ndinyom; nke mere ka ha nēkupu ọbuná ndi aru nādighi ike, nēdebe ha n'amá, tọb͕ọ ha n'ihe-ndina na ute, ka, mb͕e Pita nāga, ka ọbuná nání onyinyo-ya we kpuchie otù onye nime ha. Ọra madu nke obodo nile di Jerusalem buruburu we nāb͕akọ kwa, nēkuta ndi aru nādighi ike, na ndi ndi-mọ nādighi ọcha nēsob͕u: ewe me ka aru-ha nile n'otù n'otù di ike.