Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si, N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu, Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche? Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù, Ndi-isi zukọ-kwa-ra, Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya: n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi, ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta. Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi, n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus. Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 4
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 4:24-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo