Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri. Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si,
N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu,
Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche?
Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù,
Ndi-isi zukọ-kwa-ra,
Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya:
n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi, ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta. Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi, n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus. Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke.