Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 3:11-26

ỌLU NDI-OZI 3:11-26 IGBOB

Ma mb͕e o nējide Pita na Jọn aka, ndi-Ju nile b͕akọrọ n'ebe ha nọ n'ìbà nke anākprọ ìbà Solomon, ibobo nwuru ha n'aru nke-uku. Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije? Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya. Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu, unu we b͕ue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu; Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; Onye ayi onwe-ayi bu ndi-àmà-Ya. Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile. Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n'amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra. Ma ihe nile Chineke buru uzọ kwusa site n'ọnu ndi-amuma-Ya nile, na Kraist-Ya gāhu ahuhu, O mezuru ha otù a. Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a; ka O we zite kwa Kraist ahu Onye eburu uzọ rọputara unu, bù Jisus: Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a. Moses kwuru n'ezie, si, Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n'ihe nile, ka ha ra, bù nke Ọ gāgwa unu. Ma ọ gēru, na madu ọ bula, nke nāgaghi-ege nti Onye-amuma ahu, agēkpochapu ya n'etiti ndim. E, ndi-amuma nile site na Samuel na ndi soro ya n'azu, ka ha ra, bù ndi kwuru, ha kwusa-kwa-ra okwu banyere ubọchi nda. Unu onwe-unu bu umu ndi-amuma, na umu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke na nna-unu-hà b͕ara, mb͕e Ọ siri Abraham, Ọ bu kwa na Nkpuru-gi ka agāgọzi ab͕uru niile nke uwa. Unu bu ndi Chineke buru uzọ were Ya zitere, mb͕e O mere ka O bilie, bù Onye ahu nējere Ya ozi, igọzi unu, n'ichighari unu nile n'otù n'otù ka unu rapu ajọ ihe-unu.