O rue, na mb͕e ubọchi atọ gasiri ọ kpọkọrọ ndi bu ndi-isi n'etiti ndi-Ju: mb͕e ha biakọrọ n'otù, ọ si ha, Umu-nnem, mu onwem, ọ bu ezie na emeghm ihe ọ bula megide ndi-Ju, ma-ọbu ọme-n'ala nke nna-ayi-hà, ma esi na Jerusalem raram nye n'aka ndi Rom ka m'buru onye-nkpọrọ: ma ndi ahu, mb͕e ha kpesirim ikpé, ha zubere irapum ka m'la, n'ihi na ọ dighi ihe kwesiri onwu dim n'aru. Ma mb͕e ndi-Ju kwugidere ya, erugiderem ka m'kpọkue Sisa; ọ bughi na enwerem ihe ibo mba nkem ebubo. Ya mere n'ihi ihe nka ka m'riọrọ unu ka m'hu unu anya gwa kwa unu okwu: n'ihi na ọ bu n'ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a Ha we si ya, Ayi onwe-ayi anataghi akwukwọ-ozi site na Judia bayere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti umu-nne-ayi ruru ebe a, we kọ akukọ ma-ọbu kwue ajọ ihe ọ bula bayere gi. Ma ọ di ayi nma inu n'ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n'ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile.
Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi. Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi. Mb͕e ha nēnweghi otù olu n'etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n'ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma, si,
Jekuru ndi nka, si,
N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;
N'ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:
N'ihi na obi ndi nka mara abuba,
Nti-ha kpọchi-kwa-ra,
Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;
Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,
Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,
Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,
Ghara kwa ichighari,
Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa. Mgbe o kwusiri okwu ndia, ndi-Ju we pua, rurita uka nke-uku n'etiti onwe-ha.
O we nọgide arọ abua dum n'ulo nke aka ya o goro ego, nānara kwa ndi nile bakutere ya, nēkwusa ala-eze Chineke, nēwere kwa nkwuwa-okwu nile zí ihe nile bayere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ọ dighi onye nēb͕ochi ya.