Mb͕e ifufe nēfe nwayọ, ebe ha chère na ihe ha nēzube eruwo ha aka, ha we pua nāga n'akuku Krit. Ma mb͕e ogologo oge akāgaghi, oké ifufe jọb͕uru onwe-ya nke anākpọ Yurakwilo, we si n'ebe ahu fedata: mb͕e ifufe ahu napuru ayi ub͕ọ, mb͕e ub͕ọ apughi kwa ichegide ifufe ahu, ayi we rapu aka, ewe nēfeghari ayi. Ma ebe ayi b͕ara ọsọ rue agwe-etiti ntà nso anākpọ Klọda, ayi we nwe ike ijide ub͕ọ ntà ayi, ma ọ di ayi ike: mb͕e ha dọlitesiri ya elu, ha we chiri udọ̀ ime ka ub͕ọ-ayi sie ike, nēkebiga ya n'okpuru: ebe ha nātu egwu na agātubà ha na Satis ma eleghi anya, ha we dọda ákwà-ifufe, ewe nēfeghari ha otú a. Mb͕e ifufe nēfegidesi ayi ike, ubọchi soni ha we tufube ihe ub͕ọ nēbu; n'ubọchi nke-atọ ha we were aka-ha kpofue ihe ub͕ọ. Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n'ub͕u a.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 27
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 27
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 27:13-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị