Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 21:1-14

ỌLU NDI-OZI 21:1-14 IGBOB

Ma mb͕e o ruru na ayi dọpusiri onwe-ayi n'ebe ha nọ, nupu kwa ub͕ọ, ayi gara otù iru je Kos, ubọchi so ya ayi we rue Rodes, we si n'ebe ahu je rue Patara: ebe ayi huru ub͕o nke nāgabiga ofè Finisia, ayi we ba nime ya, we nupu. Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n'aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n'ub͕ọ na Taia: n'ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya. Mb͕e ayi chọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, ayi we nọgide n'ebe ahu ubọchi asa: ndi ahu we gwa Pọl site na Mọ Nsọ, ka ọ ghara izọbà ukwu na Jerusalem. Ma mb͕e o ruru na ayi nọzuru ubọchi ahu, ayi pua ga ije; ha nile, ha na nwunye-ha, na umu-ha, we dupu ayi n'ije-ayi, rue azu obodo-ha: ayi we b͕ue ikperè n'ala n'ótú, kpere Chineke, we kelerita ibe-ayi ekele ikpe-azu; ayi we ba n'ub͕ọ, ma ndi ahu laghachiri n'ulo-ha. Mb͕e ayi onwe-ayi jedebesiri ije-ayi n'ub͕ọ site na Taia, ayi we rue Tọlemais; ayi we kele umu-nna nime Kraist, ayi na ha we nọgide otù ubọchi. Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide. Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma. Mb͕e ayi nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, otù onye-amuma, aha-ya bu Agabọs, we si na Judia ridata. O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ. Mb͕e ayi nuru ihe ndia, ayi we riọ ya, ma ayi onwe-ayi ma ndi ebe ahu, ka ọ ghara irigoro Jerusalem. Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus. Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.