otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju: otú egwu nēmeghm ka m'ghara ikọrọ unu otù ihe n'ihe nile bara unu urù, na izí unu ihe n'iru ọra madu, n'ulo nke aka unu kwa n'otù n'otù, nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n'ebe Chineke nọ, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ. Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n'ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n'ebe ahu: ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n'obodo nile n'otù n'otù, nāsi na ab͕u na nkpab͕u nādigide nēchem. Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 20
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 20:19-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị