Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n'otù ebe. Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n'elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala. Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n'otù n'otù. Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.
Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n'okpuru elu-igwe bia. Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n'ihi na onye ọ bula n'etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu nke aka ya. Ibobo we nwua ha nile n'aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili? Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n'otù n'asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya? Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia, nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju, ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke.