O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus: o we si ha, Ùnu natara Mọ Nsọ mb͕e unu kwere? Ha si ya, É-è, kama ayi anughi ọbuná ma enyere Mọ Nsọ. O we si, Ọ̀ bu ibà nime gini kwa ka emere unu baptism? Ha we si, Ibà nime baptism nke Jọn. Pọl we si, Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n'Onye ahu Nke gaje ibia n'azu ya, nke ahu bu, na Jisus. Mb͕e ha nuru nka, ewe me ha baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus. Mb͕e Pọl bikwasisiri ha aka-ya abua n'isi, Mọ Nsọ we biakwasi ha; ha we kwue okwu n'asusu di iche iche ọzọ, bu kwa amuma. Ha nile ra ka ndikom iri na abua. O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha. Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n'iru ọra madu, o we si n'ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n'ulo-akwukwọ Tiranọs. Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 19
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 19
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 19:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo