Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 18:19-28

ỌLU NDI-OZI 18:19-28 IGBOB

Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu. Ma mb͕e ha kpere ya ka ọ nọgide oge dikariri anya, o kweghi; ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ. Mb͕e ọ puru n'ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n'Antiọk. Mb͕e ọ nọsiri n'ebe ahu oge ufọdu, ọ pua, we nāgabiga nime ala Galetia na Frijia n'usoro, nēme ka ndi nile ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike. Ma otù onye-Ju, aha-ya bu Apọlos, onye Aleksandria n'ọmumu, nke bu onye-ọ̀kà-okwu, biaruru Efesọs; ọ di kwa ike n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ. Ejiri okwu-ọnu zí nwoke a uzọ Onye-nwe-ayi; ebe ọ di ọku na mọ-ya, o we nēkwu nēzí kwa nke-ọma ihe nile bayere Jisus, ọ bu ezie na ọ mara nání baptism nke Jọn: onye ahu we malite ikwuwa okwu n'ulo-nzukọ. Ma mb͕e Prisila na Akwila nuru okwu-ya, ha kutara ya n'ebe ha nọ, we kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma kari. Mb͕e o zubere igabiga n'ofè ka ọ ba n'Akaia, umu-nna nime Kraist we me ka obi di ya ike, we degara ndi nēso uzọ Jisus akwukwọ inara ya nke-ọma: mb͕e o ruru, o yere ha aka nke-uku, bú ndi. kwereri site n'amara: n'ihi na o ji ike kwukpa ndi-Ju ọnu nke-uku, n'iru ọra madu, ebe ọ nēgosi na Jisus bu Kraist-ha site n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ.