O we biaru kwa Dabe na Listra: ma le, otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ n'ebe ahu, aha-ya bu Timọti, nwa nke otù nwanyi Ju onye kwere na Jisus; ma nna-ya bu onye-Grik. Umu-nna nime Kraist ndi bi na Listra na Aikọniọm b͕ara onye ahu ezi àmà. Nwoke a ka Pọl chọrọ ka o so ya pua; o we were ya bì ya úgwù n'ihi ndi-Ju ndi nọ n'ebe ahu: n'ihi na ha nile matara na nna-ya bu onye-Grik. Mb͕e ha nāgabiga n'obodo nile, ha we nēnye n'aka-ha iwu ahu idebe, bú nke ndi-ozi na ndi-okenye nọ na Jerusalem nyereri. Ya mere anēnye nzukọ Kraist ike n'okwukwe-ayi, ọnu-ọgugu-ha nābabiga kwa uba ókè kwa-ubọchi. Ha we nāgabiga n'ala Frijia na Galetia, ebe Mọ Nsọ b͕ochiri ha ikwu okwu Chineke n'Esia; mb͕e ha biara na ncherita-iru Misia, ha we nwa iga na Bitinia; ma Mọ nke Jisus ekweghi ha; ha we gabiga akuku Misia, we ridata na Troas. Ewe me ka Pọl hu ọhù n'abali: Otù nwoke, bú onye Masedọnia, nēguzo, nāriọ ya, si, Gabita na Masedọnia, yere ayi aka. Mb͕e ọ husiri ọhù ahu, ngwa ngwa ayi we chọ uzọ ipu ka ayi ba na Masedọnia, ebe ayi sikwutara n'obi-ayi na Chineke kpọrọ ayi-ri izì ha ozi ọma.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 16
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 16:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo