Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 15:36-40

ỌLU NDI-OZI 15:36-40 IGBOB

Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme. Banabas we zube ikuru kwa Jọn, onye anākpọ Mark, ka ya na ha yikọ je. Ma ọ dighi Pọl nma ka ha kuru onye ahu ka ya na ha yikọ je, bú onye si na Pamfilia rapu ha laghachi, ghara iso kwa ha je ọlu-ha. Oké iwe we puta n'etiti ha, nke mere ka ha kewa otù onye n'ebe ibe-ya nọ, Banabas we kuru Mark nye onwe-ya, we ba n'ub͕ọ je Saiprọs; ma Pọl rọputara Sailas, we pua, mb͕e umu-nna nime Kraist rarasiri ya nye n'amara Onye-nwe-ayi.